Hebrews 2:14 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Anyị bụ ụmụ Chineke ka e jiri ọbara na anụ ahụ mee. Jisọs gbokwasịrị onwe ya ụdị dị otu a. A mụrụ ya dị ka mmadụ efu. Nꞌihi na ọ bụ nanị dị ka mmadụ ka ọnwụ ya pụrụ ịdị ire. Site nꞌọnwụ ọ nwụrụ, ọ lara ike ajọ onye ahụ bụ ekwensu nꞌiyi. Ekwensu ahụ nwere ike ọnwụ.
Igbo 2006
Ya mere ebe umu-ntakiri ahu bu ndi nēnwekọ anu-aru na ọbara, Ya onwe-ya n'otù uzọ ahu keta-kwa-ra ihe ndia; ka O we site n'ọnwu me ka onye ahu ghara idi irè, bú onye nwere ike nke ọnwu, ya bu ekwensu;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ebe ọ bụ na ụmụ ndị ahụ ketara oke na anụ ahụ na ọbara, ya onwe ya sooro ha keta oke nʼụdịdị ahụ, ka o site nʼọnwụ ya laa onye ahụ nwere ike ọnwụ nʼiyi, onye ahụ bụ ekwensu.