Hebrews 2:17 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọ dị mkpa na Jisọs bịara nꞌụdị anyị bụ ụmụnna ya. Nꞌihi na ọ bụ nanị site nꞌụzọ dị otu a, ka ọ pụrụ ịbụ onyeisi nchụaja nwere obi ebere nꞌebe anyị nọ, na onyeisi nchụaja kwesịrị ntụkwasị obi nꞌihu Chineke, ikwuchitere anyị ọnụ anyị nꞌihi mgbaghara mmehie anyị.
Igbo 2006
O sitere na ya ji ugwọ ka eme ka O yie umu-nna-Ya n'ihe nile, ka O we ghọ onye-isi-nchu-àjà di ebere, Onye kwesi-kwa-ra ntukwasi-obi, n'ihe nile diri Chineke, ka O we me ka obi Chineke juru n'ebe nmehie nile nke ndi nke Ya di.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi nke a, e mere ka o yie ụmụnna ya nʼihe niile, ka o nwe ike ghọọ onyeisi nchụaja kwesiri ntụkwasị obi ma na nke nwere obi ebere nʼijere Chineke ozi, ka o nweekwa ike chụọ aja ikpuchi mmehie mmadụ niile.