Hebrews 2:18 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌihi na ebe ya onwe ya hụrụ ahụhụ, ọ pụrụ inyere ndị na-ahụ ahụhụ aka. Ihe banyere ọnwụnwa doro ya anya. Nꞌihi nke a ọ maara ihe bụ nsogbu anyị mgbe anyị dabara nꞌọnwụnwa. Ọ pụkwara inyere anyị aka.
Igbo 2006
N'ihi na ebe Ya onwe-ya huworo ahuhu site n'ọnwunwa anwara Ya, Ọ puru iyere ndi anānwa aka.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ebe ọ bụ na ya onwe ya tara ahụhụ mgbe a na-anwa ya ọnwụnwa, o nwekwara ike inyere ndị a na-anwa ọnwụnwa aka.