Hebrews 2:3 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ndị nupụrụ isi natara ntaramahụhụ kwesịrị ihe ọjọọ ha mere. Ọ bụrụ na a tara ha ahụhụ nꞌihi ihe ọjọọ ha mere, anyị ga-esi aṅaa gbanarị ntaramahụhụ ma ọ bụrụ na anyị elefuo oke nzọpụta ahụ anya, bụ nke Kraịst wetara? Ọ dịghị! anyị apụghị ịgbanarị ahụhụ. Onyenwe anyị nꞌonwe ya kwuru okwu nzọpụta a. Ndị na-eso ụzọ ya, bụ ndị nụrụ okwu ya kwukwara ya, gosi anyị na ọ bụ eziokwu.
Igbo 2006
àyi onwe-ayi gēsi aṅa b͕anari, ma ọ buru na ayi leghara oké nzọputa di otú a anya? bú nzọputa nke eburu uzọ kwu site n'ọnu Onye-nwe-ayi, ndi nuru ya we me ka o guzosie ike rue ebe ayi nọ;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Anyị ga-esi aṅaa gbanarị ntaramahụhụ ma ọ bụrụ na anyị eleghara oke nzọpụta ahụ anya? Ọ bụ Onyenwe anyị kwupụtara ya, bụkwa nke ndị nụrụ ya gbaara anyị ama banyere ya.