Hebrews 2:6 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Otu onye nꞌime ndị dere ihe nꞌakwụkwọ nsọ, chere echiche banyere ihe ndị a sị, “Chineke, gịnị mere i ji gụọ mmadụ na-abụghị ihe ọ bụla dị ka ihe? Gịnị mere i ji enwe obi ọcha nꞌebe mmadụ nọ? Gịnị mere gị na nwa nke mmadụ ji enwe mmekọ?
Igbo 2006
Ma otù onye kwusiri ike n'otù ebe, si, Gini ka madu bu, na I nēcheta ya? Ma-ọbu nwa nke madu, na I nēleta ya?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Otu onye agbaala akaebe nʼebe ọzọ, “Gịnị ka mmadụ bụ i ji na-eche banyere ha? Gịnị ka nwa nke mmadụ bụ iji na-elekọta ya?