Hebrews 2:8 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Chineke edoola ihe nile nꞌokpuru ụkwụ Jisọs. Ọ dịghị ihe ọ bụla na-adịghị nꞌokpuru ụkwụ ya. Ma anyị adịghị ahụ ka ihe ndị a mezuru ugbu a. Ma anyị ga-ahụ ha mgbe Jisọs ga-abịa ịbụ eze.
Igbo 2006
Ihe nile ka I doro n'okpuru ukwu-ya abua. N'ihi na na n'ido, ihe nile ahu n'okpuru ya, ọ dighi ihe ọ bula Ọ rapuru nke anēdoghi n'okpuru ya. Ma ub͕u a ayi akāhughi ihe nile ahu na edowo ha n'okpuru ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
dokwaa ihe niile nʼokpuru ụkwụ ya.” Mgbe o mere ka ihe niile dịrị nʼokpuru ya, o nwekwaghị ihe ọbụla ọ hapụrụ itinye nʼokpuru ya. Ma otu ọ dị, anyị ahụbeghị ka e doro ihe niile nʼokpuru ya.