Hebrews 2:9 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma anyị na-ahụ Jisọs, onye e mere ka ọ dị ala nanị otu mgbe. Onye e mere ka ndị mmụọ ozi dị elu karịa ya, ka ọ hụọ ahụhụ nwụọkwa nꞌihi mmadụ nile. Nꞌihi ọnwụ ọ nwụrụ, Chineke ewerela nsọpụrụ kpube ya nꞌisi dị ka okpueze.
Igbo 2006
Ma Onye ahu Nke emere Ya ka ọ di kari ndi-mọ-ozi ala nke-ntà, bú Jisus, Ya ka ayi nēle anya, na ejiwo ebube na nsọpuru kpube Ya n'isi dika okpu-eze n'ihi ahuhu nke ọnwu, ka O we site n'amara Chineke detu ọnwu ire n'ihi madu nile ọ bula.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma anyị na-ahụ Jisọs bụ onye e mere ka ọ dị ala nwantakịrị oge karịa ndị mmụọ ozi, ma ugbu a ejirila ebube na nsọpụrụ kpukwasị ya nʼisi, nʼihi ahụhụ ọnwụ nke ọ hụrụ, ka o site nʼamara Chineke detụ ọnwụ ire nʼihi mmadụ niile.