Hebrews 3:13 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Kama na-agbanụ onwe unu ume kwa ụbọchị, ogologo ụbọchị ahụ nile ihe banyere ụbọchị ahụ bụ Taa metụtara unu. Ka a hapụ inwekwa onye ọ bụla a ga-esite nꞌaghụghọ nke mmehie mee ka obi ya sie ike.
Igbo 2006
kama nāriọritanu ibe-unu aririọ kwa-ubọchi, n'ogologo oge a anākpọ ya Ta; ka obi onye ọ bula n'etiti unu ghara ime etili site n'aghughọ nke nmehie:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Kama, na-agbanụ onwe unu ume kwa ụbọchị niile dịka a kpọrọ ụbọchị ahụ Taa. Ka a hapụ inwekwa onye ọbụla a ga-esite nʼaghụghọ nke mmehie mee ka obi ya sie ike.