Hebrews 3:5 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mosisi jere ozi ya nile dị ka ohu kwesịrị ntụkwasị obi mgbe ọ nọ nꞌọrụ Chineke. Ma ọ bụ nanị ohu nꞌoge ahụ. Ọrụ nile ọ rụrụ tụrụ aka gosi anyị ihe ga-eme nꞌoge dị nꞌihu.
Igbo 2006
Ọ bu kwa ezie na Moses kwesiri ntukwasi-obi n'èzi-na-ulo-Ya dum dika onye nēje ozi, ka ọ buru ihe-àmà nke ihe nile agaje ikwu;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mosis kwesiri ntụkwasị obi dịka odibo nʼụlọ Chineke nʼihe niile, sịkwa otu a gbaa ama banyere ihe ndị a ga-ekwu nʼọdịnihu.