Hebrews 4:1 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma nkwa dịkwara anyị ugbu a ịbanye ndụ ebighị ebi, ebe izuike nke Chineke. Ya mere, ka anyị lezie anya nke ọma, ka a hapụ ịchọta onye ọ bụla nꞌetiti anyị nke na-agaghị abanye.
Igbo 2006
Ya mere ka ayi tua egwui ma, ebe nkwa ibà n'izu-ike-Ya fọduru, ọ di onye ọ bula n'etiti unu ọ gādi ka o rughi ya ma eleghi anya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, ebe ọ bụ na nkwa nke ịba nʼizuike ya ka ghere oghe, ka anyị kpachapụ anya hụ na o nweghị onye ọbụla a ga-ahụta dịka onye etozughị ya.