Hebrews 4:2 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
E kwusaalara anyị ozi ọma a. Ha onwe ha nụkwara ya. Ma ozi ọma ahụ ha nụrụ enyereghị ha aka. Nꞌihi na ha ejighị okwukwe nara ya, ha egekwaghị ntị.
Igbo 2006
N'ihi na eziwo kwa ayi ozi ọma, ọbuná dika ezi-kwa-ra ha: ma okwu nke ha nuru abaraghi ha urù, n'ihi na ejighi okwukwe tunyere ha na ndi nuru n'ezie.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na-eziela anyị oziọma ahụ, dị ka ezikwara ha: ma oziọma ahụ ha nụrụ abaraghị ha uru nʼihi na ha ejighị okwukwe nara ya.