Hebrews 4:3 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma ọ bụ nanị anyị onwe anyị ndị kwere ga-aba nꞌebe izuike Chineke. Ma banyere ndị na-ekweghị ekwe ka Chineke sịrị “Dị ka m ṅụrụ iyi nꞌiwe m, ha agaghị aba nꞌebe izuike m ma ọlị.” Ọ bụ ezie na ọ bụ Chineke kwuru okwu a, ma malite na mgbe ụwa bidoro, Chineke ejikerelarị na-eche ha.
Igbo 2006
N'ihi na ayi, bú ndi kwere ekwe, nābà n'izu-ike ahu; dika O kwuworo, si, Dika M'ṅuru iyi n'iwem, Ha agaghi-abà n'izu-ikem ma-ọli: ọ bu ezie na alusiri ọlu nile site na ntọ-ala nke uwa.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma anyị bụ ndị kweere na-abanye nʼebe izuike ahụ, dị ka Chineke si kwuo, “Aṅụrụ m iyi nʼiwe m, ‘Ha agaghị abanye nʼizuike m ma ọlị.’ ” O kwuru nke a nʼagbanyeghị na ọ rụchaala ọrụ ya site na ntọala ụwa.