Hebrews 4:6 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌihi nke a anyị na-ahụ na ozuzu ike dị nꞌihu nye ụfọdụ. Ọ bụ ezie na ndị mbụ nụrụ ozi ọma a abanyeghị nꞌebe izuike ahụ. Ha abanyekwaghị nꞌihi na ha erubeghị isi nꞌokwu Chineke site na-ekweghị ekwe ha.
Igbo 2006
Ya mere ebe ọ foduru ka ufọdu ba nime ya, ndi eburu uzọ zie ozi ọma abàghi kwa nime ya n'ihi ekweyeghi-ekwenye,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ebe ọ bụ na ohere dịịrị ụfọdụ mmadụ ịbanye nʼime ya, ma ndị ahụ buru ụzọ nata oziọma ahụ abanyeghị nʼihi nnupu isi.