Hebrews 5:1 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌihi na a na-esite nꞌetiti ndị mmadụ họpụta onyeisi nchụaja. A na-ahọpụta onye ahụ ka ọ bụrụ onye na-anọchite anya mmadụ ibe ya nꞌihu Chineke. Ọ na-achụkwa aja, na-enye Chineke onyinye nꞌihi mmehie ndị ya.
Igbo 2006
N'ihi na onye-isi-nchu-àjà ọ bula, esi n'etiti madu weputa ya, ọ bu n'ihi madu ka anēdo ya onye-isi-nchu-àjà n'ihe diri Chineke, ka o we nēche onyinye na àjà di iche iche n'ihi nmehie n'iru Chineke:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
A na-esite nʼetiti ndị mmadụ họrọ onyeisi nchụaja ọbụla, ka ọ nnọchite anya ndị mmadụ nʼihe banyere ife Chineke, ka ọ na-eche onyinye na-achụkwa aja maka mmehie dị iche iche.