Hebrews 5:12 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Lee kemgbe unu kweere na Kraịst! Unu kwesịrị izi ndị ọzọ ihe ugbu a, ma unu nọrịrị na-ele anya ka ndị ọzọ bịa zie unu, dị ka unu bụ ọbịa nꞌokwu Chineke. Ụfọdụ nꞌime unu enwebeghị ike ịghọta ozizi dị mfe dị nꞌime akwụkwọ nsọ. Ndị a dị ka ụmụ ọhụrụ. Ha na-achọ ihe dị mfe, ihe na-esighị ike, dị ka ịṅụ ara.
Igbo 2006
N'ihi na mb͕e unu kwesiri ibu ndi-ozizí n'ihi oge, ọ di unu nkpà ọzọ ka madu zí unu ihe bu ihe-ozizí mbu nke nmalite okwu si n'ọnu Chineke puta; unu aghọwo kwa ndi miri-ara di nkpà, ọ bughi nri siri ike.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼezie, ugbu a, unu kwesiri ịbụ ndị ozizi nye ndị ọzọ, ma unu ka nọ na-achọ onye ga-ezikwa unu ụkpụrụ mbụ nke okwu Chineke. Unu na-achọ mmiri ara kama nri siri ike.