Hebrews 5:7 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe Jisọs nọ nꞌụwa, o kpere ekpere nye Chineke. Mgbe ụfọdụ nꞌọnọdụ ekpere ahụ, ọ na-akwa akwa. Mgbe ọzọ kwa, anya mmiri na-ejupụta ya nꞌanya. O kpere ekpere ya nye Chineke nꞌihi na ọ maara na Chineke pụrụ ịzọpụta ya site nꞌọnwụ. Chineke nụkwara ekpere ya, nꞌihi na Jisọs bụ onye nchụaja na-erube isi.
Igbo 2006
Onye n'ubọchi nke anu-aru-Ya, mb͕e Ọ weresiri ikwa-ákwá siri ike na anya-miri che ekpere na aririọ n'iru Onye ahu puru izọputa Ya n'ọnwu, mb͕e anusi-kwa-ra olu-Ya n'ihi na Ọ turu egwu Chineke,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ọ ka dị ndụ nʼanụ ahụ, o ji oke olu na anya mmiri kpee ekpere rịọkwa arịrịọ nye onye ahụ pụrụ ịzọpụta ya site nʼọnwụ. A nụkwara olu ya nʼihi ndụ nrube isi na mweda nʼala ya.