Hebrews 6:1 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ya mere ka anyị hapụtụ ozizi ndị ahụ a na-ezi ndị kweere na Kraịst ọhụrụ, ma ka anyị lenye anya nꞌokwu ndị ọzọ gbara ọkpụrụkpụ. Ọ kwesịghị ka anyị malitekwa tọwa ntọ ala gbasara inwe okwukwe na Chineke, na inwe nchegharị site na ndụ ọjọọ ndị ahụ na-eweta ọnwụ.
Igbo 2006
N'ihi nka ka ayi rapu okwu nke nmalite nke Kraist, ka anēburu kwa ayi rue n'itozu-okè; ka ayi ghara itọ ntọ-ala ọzọ nke bu nchèghari iji pua n'ọlu nile nwuru anwu, na okwukwe ekwere na Chineke,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya bụ ka anyị na-aga nʼihu nʼihe mmụta zuru ezu, ka anyị gharakwa ịnọgide nʼihe mmụta mbụ ahụ nke anyị nwere banyere Kraịst. Anyị agaghị alaghachi azụ ịtọ ntọala nchegharị ọzọ site nʼọrụ ndị nwụrụ anwụ nʼokwukwe nʼebe Chineke nọ,