Hebrews 7:1 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Melikizedeki a bụ eze obodo Salem. Ọ bụkwa onye nchụaja Chineke onye kachasị ihe nile elu. Ọ bụ ya zutere Eberaham mgbe Eberaham si nꞌogbugbu ndị eze iri ahụ na-alọghachi. Ọ gọziri Eberaham.
Igbo 2006
N'ihi na Melkizedek nka, eze Selem, onye-nchu-àjà nke Chineke Onye kachasi ihe nile elu, onye zutere Abraham mb͕e o si n'ob͕ub͕u ndi-eze ahu laghachi, we gọzie ya,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Melkizedek a bụ eze Salem, bụrụkwa onye nchụaja Chineke Onye kachasị ihe niile elu. Ọ zutere Ebraham mgbe o si na mmeri o meriri ọtụtụ ndị eze ahụ na-alọghachi, gọziekwa ya.