Hebrews 7:11 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ugbu a ọ bụrụ na a pụrụ isite nꞌọrụ ọtụtụ ndị nchụaja zọpụta mmadụ, gịnị mere Chineke jiri zite Kraịst? Olee uru ọ bara inwe onye nchụaja dị ka Melikizedeki? Chineke gaara ezite onye nchụaja dị ka Erọọn! Ma ọ bụ nꞌihi na ọ dịghị onye nchụaja ọ bụla e sitere nꞌaka ya mee ka onye ọ bụla zuo oke. Ọ dịghị onye ọ bụla e mere ka ọ bụrụ onye ezi omume site nꞌaka ndị nchụaja nile a. Ndị nchụaja nile a batara nꞌọrụ ha site nꞌusoro iwu.
Igbo 2006
Ya mere ọ buru na ewere ọnọdu ndi-nchu-àjà ndi Livai me ka madu zue okè (n'ihi na ndi Israel anatawo iwu n'okpuru ya), nkpà gini ọzọ di ka onye-nchu-àjà di iche bilie dika usoro Melkizedek si di, ka aghara kwa igu ya dika usoro Eron si di?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụrụ na a pụrụ ime ka mmadụ zuo oke site nʼọnọdụ ndị nchụaja ndị Livayị, nʼihi na ọ bụ site nʼiwu e nyere ndị mmadụ ka e ji hiwee ọnọdụ ndị nchụaja. Olee uru ọ bara ka onye nchụaja ọzọ bịa, dị ka usoro Melkizedek si dị, na-abụghị dị ka usoro nke Erọn?