Hebrews 7:14 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọ bụ ihe a maara nke ọma na Jisọs si nꞌagbụrụ Juda pụta, agbụrụ nke dị iche nꞌagbụrụ Livayị ebe ndị nchụaja na-aesite apụta. Mosisi ekweghị ka ebo Juda bụrụ ndị nchụaja.
Igbo 2006
N'ihi na ọ putawo ìhè na Onye-nwe-ayi esiwo na Juda rọputa; bú ebo nke Moses nēkwughi ihe ọ bula bayere ndi-nchu-àjà nye ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụ ihe a mara nke ọma na Onyenwe anyị si nʼagbụrụ Juda pụta, Mosis nʼonwe ya akpọtụghị agbụrụ ahụ aha mgbe ọ na-ekwu banyere ndị nchụaja.