Hebrews 7:16 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Kraịst abụghị onye nchụaja site nꞌọmụmụ nke a mụrụ ya nꞌezinụlọ ndị nchụaja. Ọ bụkwaghị onye nchụaja site na nhọpụta nke iwu. Kama ọ bụ onye nchụaja site nꞌike ịdị ndụ nke na-enweghị ọgwụgwụ!
Igbo 2006
Onye emeworo Ya ka Ọ buru onye-nchu-àjà, ọ bughi dika iwu nke ihe enyere n'iwu nye anu-aru si di, kama dika ike nke ndu nādighi-agwu agwu si di:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Onye ghọrọ onye nchụaja ma ọ bụghị site nʼusoro iwu nke ọmụmụ ndị nchụaja, kama site nʼike dị na ndụ nke na-apụghị ịla nʼiyi.