Hebrews 7:19 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọ dịghị mgbe ọ bụla e sitere nꞌiwu mee mmadụ ọ bụla ka ọ bụrụ onye ya na Chineke ga-adị na mma. Ma ugbu a Kraịst ewetala ụzọ kachasị mma, nke anyị ga-eji nwee olileanya. Ọ na-eme ka anyị bụrụ ndị Chineke ga-anabata. Ọ na-emekwa anyị ka anyị bịaruo Chineke nso.
Igbo 2006
(n'ihi na iwu ahu emeghi ihe ọ bula ka o zue okè), ewe webata olile-anya ka nma, nke ayi ji biaru Chineke nso.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
(nʼihi na iwu ahụ emeghị ka ihe ọbụla zuo oke), ma nʼaka nke ọzọ, e webatala olileanya ka mma, bụ nke anyị na-esite na ya bịaruo Chineke nso.