Hebrews 7:2 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Eberaham kewapụtara otu ụzọ nꞌụzọ iri nke ihe nile ọ dọtara nꞌagha nye ya. Otu ụzọ nꞌụzọ iri a bụ onyinye ọchụchụ aja nꞌomume ndị na-efe Chineke. Ugbu a ihe aha a bụ Melikizedeki pụtara bụ Eze ezi omume. Aha obodo ya bụ Salem pụtara Udo. Nꞌihi nke a, a kpọkwara Melikizedeki Eze Udo.
Igbo 2006
onye Abraham kè-kwa-ra otù uzọ n'uzọ iri n'ihe nile nye, (ebe ọ bu mbu, ma asugharia aha-ya, Eze nke ezi omume, buru kwa ma emesia Eze nke Selem, nke bu, Eze nke udo;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ebraham nyekwara ya otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke ihe niile. Ihe mbụ aha ya pụtara bụ, “eze ezi omume,” ọzọkwa bụ “eze nke Salem,” nke pụtara, “eze udo.”