Hebrews 7:26 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ bụ Jisọs bụ onyeisi nchụaja mmadụ nile kwesịrị inye ndụ ha. Ọ dị nsọ dịkwa ọcha. O nweghị ntụpọ ọ bụla nꞌahụ ya. Ọ dịghị mgbe ọ bụla o mehiere. Ọ dịkwaghị mgbe ọ ga-emehie.
Igbo 2006
N'ihi na onye-isi-nchu-àjà di otú a kwesiri ayi, Onye di ọcha n'obi, Onye nēnweghi obi ọjọ, Onye anēmerughi emeru, Onye ekewapuworo n'etiti ndi-nmehie, me kwa Ya ka Ọ di elu kari elu-igwe nile;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, ọ dị mkpa na anyị ga-enwe onyeisi nchụaja dị otu a, bụ onye dị nsọ, na onye na-enweghị ntụpọ, na onye dị ọcha, na onye e kewapụrụ site nʼebe ndị mmehie nọ, ma buliekwa ya elu karịa nʼeluigwe.