Hebrews 7:27 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Jisọs adịghị ka ndị nchụaja ọzọ. Ọ dịghị mkpa na ọ ga-achụ aja nke ụmụ anụmanụ ụbọchị nile nꞌihi mmehie ya. Ọ dịkwaghị mkpa na ọ ga-achụrụ ndị mmadụ aja nꞌihi mmehie ha. Nanị otu aja karịrị ukwuu ka Jisọs chụrụ. O weere onwe ya chụọ aja nꞌelu obe nꞌihi anyị, ka ọ bụrụ ọgwụgwụ ọchụchụ aja nile, nꞌihi na aja ahụ ọ chụrụ zuru oke ruo mgbe nile.
Igbo 2006
Onye ọ nādighi Ya nkpà kwa-ubọchi, dika ndi-isi-nchu-àjà ahu, ichu àjà di iche iche, mbu n'ihi nmehie nile nke aka ya, emesia n'ihi nmehie nile nke ndi Israel: n'ihi na nka ka O mere nání otù mb͕e, mb͕e Ọ churu Onwe-ya dika àjà.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ dịghị ka ndịisi nchụaja ndị ọzọ, nʼihi na ọ dịghị mkpa na ọ ga-achụ aja kwa ụbọchị, nʼihi mmehie nke aka ya, na nʼihi mmehie nke ndị ọzọ. Naanị otu aja nke dịrị mgbe niile ka ọ chụrụ maka mmehie mgbe o weere onwe ya nye dị ka aja.