Hebrews 7:5 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ bụ ihe a maara nke ọma na ndị sitere nꞌezinụlọ Livayị bụ ndị e nyere iwu pụrụ iche ịnakọta onyinye otu ụzọ nꞌụzọ iri site nꞌaka ndị obodo ha. Ụmụnna ha nyere ha onyinye otu ụzọ nꞌụzọ iri a nꞌihi na ọ bụ ihe Chineke nyere nꞌiwu.
Igbo 2006
Ọ bu kwa ezie na ndi ahu ndi si n'etiti umu Livai puta ndi nānara ọlu onye-nchu-àjà nwere ihe enyere n'iwu inara ndi Israel otù uzọ n'uzọ iri dika iwu-ha si di, nke ahu bu, inara umu-nne-ha, ọ bu ezie na ha esiwo n'afọ Abraham puta:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma otu ọ dị, iwu kwadoro ka ụmụ Livayị bụ ndị ghọrọ ndị nchụaja na-anakọta otu ụzọ nʼime ụzọ iri site nʼaka ndị ọzọ, ya bụ, site nʼaka ndị ụmụnna ha ndị Izrel, nʼagbanyeghị na ụmụnna ha ndị ahụ bụkwa ụmụ ụmụ Ebraham.
Recommended Reading