Hebrews 8:1 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ihe anyị na-ekwu bụ nke a, anyị nwere onyeisi nchụaja dị otu a. Ọ na-anọdụkwa nꞌebe nsọpụrụ dị elu nꞌakụkụ aka nri Chineke onye dị ukwuu, nꞌeluigwe.
Igbo 2006
Ma isi ihe n'ihe nile ayi nēkwu bu nka: Ayi nwere onye-isi-nchu-àjà di otú a, Onye nọduru ala n'aka-nri nke oche-eze nke Idi-uku ahu di nime elu-igwe,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Isi okwu dị nʼihe niile anyị na-ekwu bụ nke a, na anyị nwere onyeisi nchụaja dị otu a, bụ onye na-anọdụ ala nʼaka nri nke ocheeze onye ahụ kachasị ihe niile elu nʼeluigwe.