Hebrews 8:10 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma otu a ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ ga-esi dịrị nꞌetiti mụ onwe m na ụmụ Izirel. Aga m etinye iwu m nile nꞌime mmụọ ha ka ha nwee ike ịmata ihe m chọrọ ka ha mee. Aga m edekwa iwu m nile nꞌime obi ha ka ha hapụ ichefu iwu m nile. Aga m akpọbata ha dị ka ụmụ nke m. Mụ onwe m ga-abụ Chineke ha.
Igbo 2006
N'ihi na nka bu ọb͕ub͕a-ndu nke Mu na ulo Israel gāb͕a Mb͕e ubọchi nile ahu gasiri, ka Onye-nwe-ayi kwuru; M'gētiye iwum n'uche-ha, Ọ bu kwa n'obi-ha ka M'gēdekwasi ha dika n'akwukwọ: M'gābu-kwa-ra ha Chineke, Ha onwe-ha gābu-kwa-ram otù ndi:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma nke a bụ ọgbụgba ndụ m ga-eme ka ọ dịrị nʼetiti mụ onwe m na ụlọ Izrel, mgbe oge ndị ahụ gasịrị, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. Aga m etinye iwu m nʼime uche ha, dekwasị ya nʼobi ha. Aga m abụ Chineke ha, ha onwe ha ga-abụkwa ndị m.