Hebrews 8:11 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ dịkwaghị onye ọ bụla nꞌetiti ha ga-ezi ibe ya ma ọ bụ zisaa ozi ọma nye nwanne ya, ma ọ bụ gwa onye agbata obi ya okwu sị, ‘O kwesịrị ka ị mata Chineke!’ Nꞌihi na onye ọ bụla nꞌime ha, onye ukwu na onye nta, ga-amata m, sọpụrụ m site nꞌobi ha nile.
Igbo 2006
Ha agaghi-izírita onwe-ha ma-ọli, onye ọ bula ọ nēzí onye obodo-ya, Onye ọ bula ọ nēzí kwa nwa-nne-ya, si, Mara Onye-nwe-ayi: N'ihi na ha nile gāmatam, Site n'onye dikarisiri ntà rue onye dikarisiri uku nime ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti ha ga-akụziri onye agbataobi ya ihe, maọbụ otu onye asị ibe ya, ‘Mara Onyenwe anyị,’ nʼihi na ha niile ga-ama onye m bụ, site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu.