Hebrews 8:5 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma ọrụ nile ndị nchụaja na-arụ bụ nanị onyinyo banyere ihe nke dị nꞌeluigwe. Ọ bụkwa nꞌihi nke a ka Chineke jiri gosi Mosisi mgbe ọ na-akwado iwuru ya ebe a ga-anọ fee ya ofufe nꞌọzara, otu ọ ga-esi wuo ụlọ ahụ. Chineke gwara ya okwu sị, “Lezie anya hụ na i mere ihe nile nꞌusoro dị ka m si gosi gị nꞌelu ugwu.”
Igbo 2006
ndi-nchu-àjà ndi nēkpe ekpere nime ihe-nṅomi na onyinyo nke ebe di n'elu-igwe, dika Chineke duworo Moses ọdú mb͕e ọ gaje imazu ulo-ikwū ahu: n'ihi na Ọ nāsi, Le anya ka i me ihe nile dika ihe-atù ahu si di nke egosiri gi n'ugwu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha na-eje ozi nʼebe nsọ ahụ nke bụ oyiyi na onyinyo banyere ihe nke dị nʼeluigwe. Ọ bụ nke a mere e ji dọọ Mosis aka na ntị mgbe ọ na-akwado iwu ụlọ ikwu ahụ, “Lezie anya hụ na i mere ihe niile nʼusoro dị ka e si gosiri gị nʼelu ugwu.”