Hebrews 8:6 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma ọrụ nchụaja nke Chineke nyere Jisọs karịrị nke ndị nchụaja ndị Juu mma. Otu a kwa, ọgbụgba ndụ Kraịst mere ka ọ dịrị nꞌetiti Chineke na mmadụ dabeere na nkwa dị mma karịa nkwa ọgbụgba ndụ ochie ahụ.
Igbo 2006
Ma otú ọ di, O ruwo n'ifè-òfùfè nke ka nma, n'uzọ ra otú Ọ bu kwa onye-ob͕ub͕o nke ọb͕ub͕a-ndu ka nma, bú ọb͕ub͕a-ndu nke enyeworo n'iwu n'elu nkwa ufọdu ka nma.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma otu ọ dị, ọ natara ọrụ ije ozi karịrị nke ha, dị ka onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ dị elu karịa nke ochie, ebe ọgbụgba ndụ nke ọhụrụ a o mere ka ọ dịrị nʼetiti ya na mmadụ dabeere na nkwa dị mma karịa.