Hebrews 8:9 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọgbụgba ndụ ọhụrụ a agaghị adị dị ka nke mụ na nna nna unu ochie ha gbara nꞌime ọzara. Nꞌoge ahụ, eji m aka m dupụta ha site nꞌala Ijipti, ma ha edebeghị ọgbụgba ndụ ahụ. Nꞌihi nke a mụ onwe m hapụrụ ha.
Igbo 2006
Ọ bughi dika ọb͕ub͕a-ndu ahu si di nke Mu na ndi bu nna-ha b͕ara N'ubọchi M'jidere ha n'aka isi n'ala Ijipt duputa ha; N'ihi na ha onwe-ha anọgideghi n'ọb͕ub͕a-ndum, Mu onwem lefukwara ha anya, ka Onye-nwe-ayi kwuru,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụghị ụdị ọgbụgba ndụ mụ na nna nna ha gbara, mgbe m jidere ha nʼaka site nʼala Ijipt dupụta ha, nʼihi na ha anọgideghị bụrụ ndị kwesiri ntụkwasị obi idebe ọgbụgba ndụ m. Nʼihi ya, echepụrụ ihu m nʼebe ha nọ, ka Onyenwe anyị kwupụtara.