Hebrews 9:1 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌime ịgba ndụ nke mbụ, Chineke nyere ụmụ Izirel ụkpụrụ ha ga-eso ife ya ofufe. Ha nwere ụlọ ikwu ebe ha na-efe Chineke.
Igbo 2006
Ya mere, ọbuná ọb͕ub͕a-ndu mbu nwere ihe di iche iche aguru n'ihe ziri ezi n'ikpere Chineke, nwe kwa ebe nsọ ya, bú ebe nsọ nke uwa nka.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọgbụgba ndụ nke mbụ nwere usoro ofufe na ebe nsọ nke ụwa nke a e jiri aka wuo.