Hebrews 9:10 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌime usoro nke mgbe ochie ahụ, a gwara ha ụdị ihe oriri na ụdị ihe ọṅụṅụ ha kwesịrị iri na ịṅụ. A gwakwara ha ụdị mmemme dị iche iche ha ga-eme nꞌihi ido onwe ha nsọ. Ma enyeghị ha usoro ndị a ka ọ dịrị ruo mgbe ebighị ebi. E nyere ha usoro ndị a ka ọ bụrụ iwu ga-enyere ha aka ife Chineke tutuu ruo mgbe Chineke ga-edozigharị ihe nile.
Igbo 2006
ebe ha bu nání (ha na ihe-oriri na ihe-ọṅuṅu na ime-baptism di iche iche) ihe di iche iche nke anu-aru aguru n'ihe ziri ezi, enyere n'iwu rue oge imezi ihe.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Kama ha bụ naanị usoro iwu metụtara ihe oriri na ihe ọṅụṅụ na ụdị baptizim dị iche iche nke anụ ahụ, bụ nke e nyere ka a na-eme ya ruo mgbe a ga-edozigharị ihe niile.