Hebrews 9:11 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma Kraịst abịalarị. Ya onwe ya bụ ezi onyeisi nchụaja nke ọnọdụ ọhụrụ ahụ anyị nwere ugbu a. Ebe ọ na-arụ ọrụ nchụaja ya abụghị nꞌụlọ mmadụ jiri aka wuo. Kama ọ bụ nꞌụlọ nchụaja zuru oke dị nꞌeluigwe.
Igbo 2006
Ma Kraist, ebe Ọ biara ka Ọ buru onye-isi-nchu-àjà nke ezi ihe nile gaje ibia, O sitere n'ulo-ikwū ahu nke ka uku na nke zuru okè kari, ọ bughi nke eji aka me, nke isi-ya bu, ọ bughi nke òkìkè a,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe Kraịst bịara dị ka onyeisi nchụaja nke ezi ihe ahụ dị ugbu a, site nʼụlọ ikwu dị ukwuu zuruoke nke a na-ejighị aka mee, nke na-esoghị nʼihe e kere eke,