Hebrews 9:12 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Otu mgbe nanị ka Kraịst bara nꞌebe kachasị nsọ nke ụlọ ikwu ahụ. O jighị ọbara ewu na ọbara ebule chụọ aja. Kama o jiri ọbara nke ya onwe ya. O jiri ọbara ya chụọ aja nanị otu mgbe. O sitere na nke a mee ka anyị nweta nzọpụta ebighị ebi.
Igbo 2006
O siteghi kwa n'ọbara nke ewu na nke umu-ehi, kama O sitere n'ọbara nke Ya onwe-ya, ba n'ebe nsọ nání otù mb͕e, ebe Ọ chọputara nb͕aputa ebighi-ebi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
o jighị ọbara ụmụ ewu na nke ụmụ ehi banye nʼebe ahụ, kama o ji ọbara nke ya onwe ya banye nʼEbe ahụ Kachasị Nsọ naanị otu mgbe, jiri ya wetara anyị niile mgbapụta ebighị ebi.