Hebrews 9:14 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
ọbara Kraịst ọ̀ pụghị ime ka anyị dị ọcha karịa? Nꞌezie ọbara ya zubigara oke ịsachpụ mmehie anyị nile, nꞌihi na Kraịst sitere na Mmụọ nke na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi were onwe ya nye na-enweghị ntụpọ. Ọbara ya zubigara oke ịsacha obi anyị na ime anyị ka anyị dị ọcha site nꞌajọ ọrụ nile, bụ ọrụ nke na-eweta ọnwụ. Aja o jiri onwe ya chụọ, mere ka anyị nwere onwe anyị, ka anyị nwee ike ife Chineke onye dị ndụ.
Igbo 2006
ọ̀bara Kraist, Onye sitere n'aka Mọ ebighi-ebi che Onwe-ya nātaghi uta n'iru Chineke, gēsi aṅa ghara ime akọ-na-uche-ayi ka ọ di kari ọcha nke-uku ri nne pua n'ọlu nile nwuru anwu ikpere Chineke di ndu?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọbara Kraịst onye sitere na Mmụọ dị ebighị ebi were onwe ya chụọrọ Chineke aja nʼenweghị ntụpọ ọbụla, ọ ga-esi aṅaa ghara ịsachapụ omume ruru unyi nke akọnuche anyị, ka anyị nwee ike ife Chineke dị ndụ.