Hebrews 9:19 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌihi na mgbe Mosisi nyechara ndị Juu iwu Chineke ahụ, o weere ọbara ewu na nke ehi tinyere mmiri, fesaa ya nꞌelu akwụkwọ iwu Chineke na nꞌelu mmadụ nile nọ nꞌebe ahụ nꞌoge ahụ. Ọ bụ alaka osisi hisọpụ na akpụkpọ aji nwa atụrụ na-acha odo odo ka o ji fesaa ọbara na mmiri ahụ.
Igbo 2006
N'ihi na mb͕e Moses gwarari ndi Israel nile ihe nile ọ bula enyere n'iwu dika iwu ahu si di, ọ nara ọbara nke umu-ehi na ewu nile, ya na miri na aji-anu uhie na hyssop, we fesa akwukwọ ahu onwe-ya, na ndi Israel nile,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe Mosis kwupụtachara ndị mmadụ iwu ahụ, o weere ọbara ụmụ ehi na ewu, ya na mmiri, ogbo uhie na hisọp fesaa nʼakwụkwọ iwu ahụ nakwa nʼelu mmadụ niile.