Hebrews 9:2 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ụlọ ikwu a nwere ọnụ ụlọ abụọ. Nꞌime ọnụ ụlọ nke mbụ e nwere ebe a na-adọkwasị iheọkụ. Tebulu ebe a na-adọkwasị beredi dị nsọ dịkwa nꞌime ụlọ a. A na-akpọ ọnụ ụlọ nke mbụ a, Ebe Nsọ.
Igbo 2006
N'ihi na edoziri ulo-ikwū, ulo mbu, nke ihe-idọba-oriọna ahu, na table ahu, na ob͕e achicha ahu anēche n'iru Chineke di nime ya; nke anākpọ Ebe Nsọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
E guzobere ụlọ ikwu. Nʼọnụụlọ nke mbụ nʼụlọ ikwu ahụ, e nwere ihe ịdọba iheọkụ, na tebul, na achịcha e doro nsọ. Aha ọnụụlọ nke mbụ a bụ Ebe Nsọ.