Hebrews 9:23 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nke a na-ezipụta na ụlọ ikwu ahụ na ihe nile dị nꞌime ya bụ ụdị ihe nile dị nꞌeluigwe. Nꞌihi nke a, ọ dị mkpa na ihe nile dị nꞌime ụlọ ikwu a na ụlọ ikwu nꞌonwe ya kwesịrị ka e were ọbara mee ka ha dị ọcha. Otu aka ahụ, ihe nile dị nꞌeluigwe, bụ ihe ahụ ụlọ a dị nꞌụwa yiri, ka e mere ka ha dịkarịa ọcha site nꞌịta dị oke ọnụ ahịa bụ obara Kraịst.
Igbo 2006
Ya mere ọ di nkpà ka ewere ihe ndia me ka ihe-nṅomi nile nke ihe nile di n'elu-igwe di ọcha; ma ọ di nkpà ka ewere àjà ka ndia nma me ihe ahu onwe-ha nke di n'elu-igwe ka ha di ọcha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
O kwesiri ka e si otu a mee ka ihe ndị a yiri ihe ndị dị nʼeluigwe dị ọcha, ma ihe ndị dị nʼeluigwe nʼonwe ha kwesiri ka e nye ha aja dị mma karịa.