Hebrews 9:24 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌihi na Kraịst abanyeghị nꞌụlọ nsọ dị nꞌụwa, nke mmadụ wuru. Kama o rigooro nꞌeluigwe ebe ọ nọ ugbu a na-ekwuchitere anyị ọnụ anyị nꞌihu Chineke nꞌonwe ya.
Igbo 2006
N'ihi na Kraist abàghi n'ebe nsọ eji aka me, bú ihe-atù yiri ebe nke bu ebe nsọ n'ezie; kama Ọ bàra n'elu-igwe onwe-ya, igosi Onwe-ya n'iru Chineke n'ihi ayi ub͕u a:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na ọ bụghị nʼebe nsọ nke mmadụ jiri aka wuo, nke yiri nke dị nʼeluigwe, ka Kraịst banyere, kama ọ banyere nʼime eluigwe nʼonwe ya, bụ ebe ọ na-anọchite anya anyị ugbu a nʼihu Chineke.