Hebrews 9:26 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
A sịkwarị na ọ bụ ihe dị mkpa na Kraịst kwesịrị iji onwe ya chụọ aja ọtụtụ mgbe ọ gaara na-anwụ site nꞌoge ruo nꞌoge kemgbe ụwa bidoro. Ma o sighị otu a dị! Kama Kraịst bịara nanị otu ugboro mgbe ọgwụgwụ ihe nile dị nso, iwepụ mmehie site nꞌiji onwe ya chụọ aja.
Igbo 2006
n'ihi na asi na ọ di otú a Ọ ghaghi ihu ahuhu ọtutu mb͕e site na ntọ-ala nke uwa: ma otú ọ di, ọ bu nání otù mb͕e nime nruzu nke oge ndia ka emeworo ka Ọ puta ìhè, ka O we site n'ichu Onwe-ya dika àjà me ka nmehie ghara idi irè.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụrụ na o si otu a dịrị, ọ gaara abụ onye na-ahụ ahụhụ mgbe kemgbe e kere ụwa. Ma, dị ka o si dị, ọ bịara naanị otu ugboro nʼọgwụgwụ oge ndị a, iwezuga mmehie site nʼiji onwe ya chụọ aja.