Hebrews 9:28 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
otu a kwa, Kraịst nwụrụ nanị otu ugboro, dị ka aja a chụrụ nꞌihi mmehie mmadụ nile. Ọ nwụrụ ma Chineke mere ka o site nꞌọnwụ bilie. Ọ ga-abịa ọzọ! Ma ọ bụghị maka ịchụ aja ọzọ nꞌihi mmehie anyị, kama ọ ga-abịa iwetara ndị nile ji okwukwe na olileanya na-eche ọbịbịa ya nzọpụta.
Igbo 2006
n'uzọ ra otú a Kraist, ebe echere Ya n'iru Chineke nání otù mb͕e iburu nmehie nile nke ọtutu madu, Ọ gēme kwa ka ndi nēche Ya hu Ya anya nke ub͕ò abua, ma nmehie adighi ya, ka ewe zọputa ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
otu a ka e si chụọ Kraịst dị ka aja naanị otu ugboro iwepụ mmehie ọtụtụ mmadụ. Ọ ga-abịaghachi nke ugboro abụọ, ma ọ bụghị nʼihi ibu mmehie, kama ọ bụ nʼihi iweta nzọpụta nye ndị ahụ niile na-eche ọbịbịa ya.