Hebrews 9:4 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌime ụlọ nke abụọ ahụ, ebe ịchụ aja dị ya nke e jiri ọlaedo wuo. Nꞌelu ebe ịchụ aja a ka a na-achụ aja nsure ọkụ. Nꞌebe a kwa ka igbe ọgbụgba ndụ Chineke dị. E ji ọlaedo machie ahụ ya. Nꞌime igbe a mbadamba nkume dị ya. Nke a bụ nkume ahụ Chineke dere iwu iri nꞌelu ya. Otu ite ntakịrị e jiri ọlaedo kpụọ dịkwa nꞌime igbe a. Nꞌime ite ahụ, mana dị ya. Mana bụ nri dị iche Chineke jiri zụọ ndị Juu mgbe ha na-aga ije nꞌọzara. Mkpa nꞌaka Erọọn dịkwa nꞌime igbe a. Nke a bụ mkpa nꞌaka ahụ wepụtara ahihia ndụ nꞌọzara.
Igbo 2006
nke nwere ebe-ichu-àjà ọla-edo isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na ib͕e nke ọb͕ub͕a-ndu ahu nke amachitara ọla-edo gburugburu n'akuku nile, nke ite ọla-edo nke nwere manna di nime ya, ya na nkpa-n'aka ahu nke Eron nke mara ifuru, na mbadamba nkume abua nke ọb͕ub͕a-ndu ahu;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
nke nwere ebe ịchụ aja mgbaisiọma e ji ọlaedo wuo, na igbe ọgbụgba ndụ ahụ nke e jiri ọlaedo machie ahụ ya niile. Ihe dị nʼime ite ahụ bụ mánà na mkpanaka Erọn nke ahụ puputara ahịhịa, ya na mbadamba nkume e dekwasịrị iwu ọgbụgba ndụ.