Hebrews 9:5 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌime ọnụ ụlọ nke abụọ ahụ, ọ bụrụ na e lee anya nꞌelu igbe ọgbụgba ndụ ahụ, a ga-ahụ ndị mmụọ ozi a kpụrụ akpụ. Ha nwere nku dị ka nnụnụ. Aha ha bụ Cherubim. Ha bụ ndị na-echekwa otuto Chineke. Ma anyị enweghị ike ịkọwacha ihe nile ndị a.
Igbo 2006
ma n'elu ya cherubim nke ebube di nēnye ebe anēme ka obi Chineke juru ǹdò; nke ayi nēnweghi ike ikwu okwu bayere ha n'otù n'otù ub͕u a.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ihe dị nʼelu igbe a bụ cherubim nke ebube ya, na-ekpuchite oche amara ahụ. Ma anyị enweghị ike ịkọwacha ihe niile ndị a nʼozuzu oke ugbu a.