Hebrews 9:6 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe e doro ihe nile ndị a nꞌusoro, onye nchụaja na-abata. Ọ na-abata mgbe ọ bụla nꞌime ọnụ ụlọ nke mbụ nke ụlọ ikwu a. Nꞌebe a ka ọ na-arụ ọrụ o ketara ịrụ ụbọchị nile nye Chineke.
Igbo 2006
Ma ebe edoziworo ihe ndia otú a, ndi-nchu-àjà nābà n'ulo-ikwū mbu mb͕e nile, nēkpezu ekpere nile ha;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe e doro ihe niile ndị a nʼusoro, onye nchụaja na-abata mgbe ọbụla nʼime ọnụụlọ nke mbụ nke ụlọ ikwu a. Nʼebe a ka ọ na-arụ ọrụ o ketara ịrụ.