Hebrews 9:7 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma ọ bụ nanị onyeisi nchụaja na-aba nꞌebe ahụ a na-akpọ Ebe Nsọ Kachasị ebe Nsọ. Ọ na-aba nꞌebe ahụ nanị otu mgbe nꞌafọ. Ọ na-ejikwa ọbara na-aba nꞌebe ahụ. Ọbara ọ ga-eji buru ụzọ chụọ aja nꞌihi mmehie nke onwe ya. Mgbe ọ chụchara aja nꞌihi onwe ya, ọ na-achụkwa aja nꞌihi ndị ya nile.
Igbo 2006
ma nání onye-isi-nchu-àjà nābà n'ulo-ikwū nke-abua, nání otù mb͕e n'arọ, nāb͕aghi aka ọbara, nke ọ nēche n'iru Chineke n'ihi onwe-ya, na n'ihi amaghi-ama nile nke ndi Israel:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ọ bụ naanị onyeisi nchụaja na-abanye nʼime ọnụụlọ nsọ nke abụọ, naanị otu ugboro nʼafọ. Ọ na-ejikwa ọbara na-aba nʼebe ahụ, iji chụọ aja maka onwe ya na nʼihi mmehie ndị mmadụ mere na-amaghị ama.