Hosea 1:10 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ma ọnu-ọgugu umu Israel gādi ka ájá oké osimiri, nke anāgagh ātùta, nke anāgaghi-agu kwa ọnu; ọ gēru kwa na, n'ebe ahu nke anāsi ha, Ọ bughi ndim ka unu bu, n'ebe ahu ka agāsi ha, Umu Chineke di ndu ka unu bu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ma ọnụọgụgụ ụmụ Izrel ga-adị ka aja dị nʼọnụ oke osimiri nke a na-apụghị ịgụta ọnụ maọbụ tụọ nʼihe ọtụtụ. Nʼebe ahụ a nọ sị ha, ‘Unu abụghị ndị m,’ nʼebe ahụ ka a ga-anọ sịkwa ha, ‘Ụmụ Chineke dị ndụ ka unu bụ.’