Hosea 6:9 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ọzọ, dika usu ndi nāpunara madu ihe nēche anwu onye ọ bula, otú a ka òtù ndi-nchu-àjà nēb͕u madu n'uzọ Shekem: e, ajọ ihe-nzube ka ha meworo.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Dịka ndị na-apụnara mmadụ ihe na-ezo na-eche onye ga-agafe, otu a ka ndị nchụaja si egbu ndị mmadụ nʼụzọ Shekem, leenụ oke ajọ omume ihere dị otu a.