Hosea 9:4 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ha agaghi-awusiri Jehova àjà manya-vine, àjà di iche iche ha agaghi-atọ kwa Ya utọ: dika nri ndi nēru újú ka nri-ha gādiri ha; ndi nile ndi nēri ya gāghọ ndi ruru árú: n'ihi na nri-ha gādiri ọchichọ nkpuru-obi-ha; ọ gaghi-abata n'ulo Jehova.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha agaghị awụsa ihe ọṅụṅụ dịka aja nye Onyenwe anyị, nʼihi na ọdịghị aja ha ga-achụ ga-atọ ya ụtọ. Aja ndị a ga-adị ha ka nri nke ndị na-eru ụjụ si dị. Onye ọbụla riri nri ndị a ga-abụ onye na-adịghị ọcha. Nri ndị a ga-adịrị naanị ha onwe ha, ha agaghị ewebata ya nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.